Isaiah 16

1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye
nye onye na-achị ala ahụ
site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara
ruo ugwu nke Ada Zayọn.
2Ndị inyom Moab
nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn
Mmiri Anọn nke dị nʼakụkụ ugwu oke ala ahụ, bụ iyi dị mkpa nʼala Moab Ọnụ 21:13-14

na-akwụgharị
dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.

3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”
“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.
Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị
nʼetiti oke ehihie.
Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,
ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,
ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”

Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,
mbibi ga-akwụsịkwa,
onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;
otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,
otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,
bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,
na-emekwa ngwa ime ezi omume.

6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,
nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile.
Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?
Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,
ha na-ebetara Moab akwa.
Kwasie akwa ike, nwee mwute,
nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;
osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.
E, ndị eze mba dị iche iche azọdala
ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.
E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,
ruokwa nʼọzara,
nke mgbọrọgwụ ha gbasara
ruo nʼọnụ osimiri.
9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza d si akwa akwa
nʼihi ubi vaịnị Sibma.
Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ
gị Heshbọn, na gị Eleale,
nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada
mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,
ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;
ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;
nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,
ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu,
ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya,
mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya,
o nweghị uru nke a ga-abara ha.
13Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ, 14ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

Copyright information for IboBIU